25. Matanaia na Bakbukia na Obadia na Meshulam na Talmon na Akub bu ndi-ọnu-uzọ-ama nēdebe ihe-ndebe-ha n'ulo-nchikọbata-ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nile.
26. Ndia nọ n'ubọchi Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, na n'ubọchi Nehemaia, bú onye nāchi ala, na nke Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ.
27. Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.
28. Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n'obodo ntà nile nke ndi Netofa;
29. site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.