Nehemaia 11:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.

4. Ma na Jerusalem ka ufọdu nime umu Juda na nime umu Benjamin biri. Site n'umu Juda: Ataia nwa Uzaia, nwa Zekaraia, nwa Amaraia, nwa Shefataia, nwa Mahalalel, site n'umu Perez;

5. na Maaseia nwa Beruk, nwa Kọl-hose, nwa Hazaia, nwa Adaia, nwa Joiarib, nwa Zekaraia, nwa onye Shailo.

6. Umu Perez nile ndi bi na Jerusalem di nnù na ọgu atọ na asatọ, ndikom bu dìnkpà.

Nehemaia 11