Nehemaia 11:16-26 Bible Nso (IGBOB)

16. na Shabetai, na Jozabad, ndi sitere na ndi-isi ndi Livai, ndi bu ndi-isi nke ije-ozi nke èzí diri ulo Chineke;

17. na Matanaia nwa Maika, nwa Zabdi, nwa Esaf, onye bu isi nāmalite ikele ekele n'ekpere, na Bakbukia, bú onye nke-abua n'umu-nne-ya; na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun.

18. Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.

19. Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.

20. Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.

21. Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.

22. Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.

23. N'ihi na ihe eze nyere n'iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya.

24. Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.

25. Ma n'obodo ntà nle n'ọhia-ha, ufọdu nime umu Juda biri na Kiriat-aba na umu-obodo-ya, na nime Dibon na umu-obodo-ya, na nime Jekabzeel na obodo ntà ya;

26. na nime Jeshua, na nime Molada, na nime Bet-pelet;

Nehemaia 11