Nehemaia 1:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na anọdurum ala, kwa ákwá, rue újú ubọchi ufọdu; m'we bue ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe,

5. si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:

6. biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.

7. Ayi emejọwo Gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu.

8. Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile:

9. ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.

10. Ma ndia bu orù-Gi na ndi-Gi, ndi I were ike uku Gi, were kwa aka-Gi di ike, b͕aputa.

11. Biko, Onye-nwe-ayi, biko, ka nti-Gi nāṅa nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, ndi ọ nātọ utọ itu egwu aha-Gi: biko, me kwa ka ihe nāgara orù-Gi nke-ọma ta, me ka enwe obi-ebere n'aru ya n'iru nwoke a. (Ma mu onwem buru eze obu-ihe-ọṅuṅu.)

Nehemaia 1