32. N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;
33. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà:Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.