9. Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;
10. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;
11. Ọ dighi onye nāghọta,Ọ dighi onye nāchọ Chineke;
12. Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù;Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:
13. Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ:Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:
14. Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:
15. Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;
16. Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;
17. Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:
18. Egwù Chineke adighi n'anya-ha.
19. Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:
20. n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.
21. Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;
22. ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;
23. n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;
24. anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:
25. Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;