14. Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:
15. Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;
16. Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;
17. Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:
18. Egwù Chineke adighi n'anya-ha.
19. Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ: