5. Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n'otù ihe ahu n'etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ:
6. ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.
7. N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.
8. N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,
9. ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.
10. Ọzọ kwa Ọ si,Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ.
11. Ọzọ kwa,Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile;Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya.
12. Ọzọ kwa, Aisaia si,Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi,Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile;Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.
13. Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.
14. Ma emewom ka m'kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n'idi-nma, na emejuwo kwa unu n'ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú.
15. Ma ejikaririm anya-ike degara unu akwukwọ n'otù akuku, dika ọ bu ichetara unu ọzọ, n'ihi amara nke Chineke nyerem,
16. ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.