Ndi Rom 15:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.

2. Onye ọ bula n'etiti ayi, ya me ihe gātọ onye-ab͕ata-obi-ya utọ iwetara ya ezi ihe, ka ọ we wulie ya elu dika ulo.

3. N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.

4. N'ihi na ka ha ra, bú ihe edere n'akwukwọ nsọ n'oge gara aga, edere ha izí ayi ihe, ka ayi we were ntachi-obi na nkasi-obi nke ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ nwe olile-anya.

5. Ma ka Chineke nke ntachi-obi na nke nkasi-obi nye unu ka unu tukwasi uche n'otù ihe ahu n'etiti-onwe-unu dika Kraist Jisus si chọ:

6. ka unu we ji otù obi ji kwa otù olu nēnye Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist otuto.

7. N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.

8. N'ihi na asim na emewo Kraist ka Ọ buru onye nējere obibì-úgwù ozi n'ihi ezi-okwu Chineke, ka O we me ka nkwa nile ekwere nna-ayi-hà guzosie ike,

9. ka ndi mba ọzọ we nye kwa Chineke otuto n'ihi ebere-Ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,N'ihi nka ka M'gēkwuputa Gi n'etiti mba nile,Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.

10. Ọzọ kwa Ọ si,Unu mba ọzọ, soronu ndi-Ya nwe obi-utọ.

11. Ọzọ kwa,Tonu Onye-nwe-ayi, unu mba nile;Ka ndi nile di iche iche nāja kwa Ya.

12. Ọzọ kwa, Aisaia si,Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi,Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile;Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.

Ndi Rom 15