Ndi Rom 1:27-32 Bible Nso (IGBOB)

27. otú a ndikom rapu-kwa-ra otú anēme nwanyi site ka esi mu ya, we re ọku n'agu-ha n'aru ndikom-ibe-ha, ndikom nāluputa ihe nādighi nma n'anya n'aru ndikom, nānara kwa nime onwe-ha ugwọ-ọlu ahu nke njehie-ha nke ha nāghaghi inara.

28. Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;

29. ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,

30. ndi nēkwutọ madu, ndi nākpọ Chineke asì, ndi nēme madu ihe-ihere, ndi-npako, ndi nānya isi, ndi nāchọputa ihe ọjọ, ndi nēkweyeghi ndi muru ha,

31. Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:

32. madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.

Ndi Rom 1