23. Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.
24. Agāgọzi Jael kari ndinyom,Bú nwunye Heba onye-Kenait,Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.
25. Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.
26. Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike;O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi,O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.
27. N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.