13. Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.
14. Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu.
15. Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya.