Ndi-Ikpe 3:27-31 Bible Nso (IGBOB)

27. O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha.

28. Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.

29. Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya.

30. Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.

31. Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.

Ndi-Ikpe 3