13. Nzukọ Israel nile we ziga, gwa umu Benjamin okwu, bú ndi nọ na nkume di elu, bú Rimon, we kpọ ha òkù udo.
14. Benjamin we lata na mb͕e ahu; ha we nye ha ndinyom ahu ndi ha mere ka ha di ndu site na ndinyom Jebesh-gilead: ma ha achọtaghi nwunye gēzuru ha nile otú a.
15. Ndi Israel we cheghari uche bayere Benjamin, n'ihi na Jehova emewo ntiwa n'ebo Israel nile.
16. Ndi-okenye nzukọ Israel we si, Gini ka ayi gēmere ndi fọduru inye ha nwunye, n'ihi na ekpochapuwo ndinyom nime Benjamin?
17. Ha we si, Ihe-nnweta nke ndi b͕apuru ab͕apu ka ala nke Benjamin bu, ka aghara ihichapu ebo n'Israel.
18. Ma ayi onwe-ayi apughi inye ha nwunye sitere n'umu-ayi ndinyom: n'ihi na umu Israel ṅuru iyi, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēnye Benjamin nwunye.
19. Ha we si, Le, ememe Jehova di na Shailo kwa-arọ, nke di n'akuku Ugwu Bet-el, n'akuku ọwuwa-anyanwu nke uzọ atuliri atuli nke nārigo site na Bet-el rue Shekem, na n'akuku Ndida nke Lebona.
20. Ha we nye umu Benjamin iwu, si, Jenu, che anwu n'ubi-vine;
21. hu-kwa-nu, ma, le, ọ buru na umu-ndinyom Shailo aputa ite egwú nime otiti-egwú-ha, unu gēsi kwa n'ubi-vine puta, nwudere onwe-unu, nwoke ọ bula nwunye-ya, site n'umu-ndinyom Shailo, la n'ala Benjamin.
22. O gēru kwa, mb͕e ndi bu nna-ha ma-ọbu umu-nne-ha biara ichọ ayi okwu, na ayi gāsi ha, Nyenu ayi ha n'amara: n'ihi na ayi anwudeghi nye nwoke ọ bula nwùnye-ya n'agha: ma unu onwe-unu eweghi ha nye ha; ma ọ bughi otú a, ikpe gāma unu ub͕u a.
23. Umu Benjamin we me otú a, kuru nwunye, dika ọnu-ọgugu-ha si di, site na ndinyom nēte egwū, ndi ha nāpunara ndi Shailo: ha we je lata n'ihe-nketa-ha, wue obodo-ha, biri nime ha.
24. Umu Israel we si n'ebe ahu la na mb͕e ahu, nwoke ọ bula ọ lakuru ebo-ya, lakuru ab͕uru-ya, ha we si n'ebe ahu pua, nwoke ọ bula rue ihe-nketa-ya.
25. Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel, onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.