37. Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile.
38. Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo.
39. Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu.
40. Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe.
41. Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru.
42. Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha.
43. Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu.
44. Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà.
45. Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise.