Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a?