Ndi-Ikpe 18:22-25 Bible Nso (IGBOB)

22. Mb͕e ndi ahu nọ n'ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n'ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan.

23. Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi?

24. Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?

25. Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n'etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi.

Ndi-Ikpe 18