Ndi-Ikpe 18:17-24 Bible Nso (IGBOB)

17. Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.

18. Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?

19. Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel?

20. Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n'etiti ndi ahu.

21. Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n'iru ha.

22. Mb͕e ndi ahu nọ n'ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n'ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan.

23. Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi?

24. Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?

Ndi-Ikpe 18