14. Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n'ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme.
15. Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya.
16. Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n'umu Dan, nēguzo kwa n'oghere ọnu-uzọ-ama.
17. Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.
18. Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?