Ndi-Ikpe 11:38-40 Bible Nso (IGBOB)

38. Ọ si, Je. O we zipu ya ọnwa abua: o we je, ya onwe-ya na umu-ab͕ọghọ-ibe-ya, kwa ákwá bayere ọnọdu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ọ nọ n'elu ugwu.

39. O rue, n'ọgwugwu ọnwa abua, na ọ laghachikuru nna-ya, o me ya nkwa-ya nke o kwere: nwata ahu amaghi kwa nwoke. O we buru ukpuru n'Israel,

40. na umu-ndinyom Israel nēje kwa-arọ ikọ akukọ nwa-nwayi Jefta onye Gilead ubọchi anọ n'arọ.

Ndi-Ikpe 11