Ndi-Ikpe 1:19-25 Bible Nso (IGBOB)

19. Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.

20. Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.

21. Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta.

22. Ma ulo Josef, ha onwe-ha rigoru-kwa-ra Bet-el: Jehova we nọyere ha.

23. Ulo Josef we ziga iledo Bet-el. (Ma aha obodo ahu na mb͕e gara aga bu Luz.)

24. Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.

25. Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.

Ndi-Ikpe 1