16. Umu onye-Kinait, bú nna nwunye Moses, we si n'obodo nkwu soro umu Juda rigo n'ọzara Juda, nke di na Ndida nke Arad, ha we je biri n'etiti ndi ahu.
17. Juda we je, ya na Simeon, bú nwa-nne-ya, tib͕ue ndi Kenean ndi bi na Zefat, we wezuga ya ka ebibie ya. Ewe kpọ aha obodo ahu Họma.
18. Juda were kwa Geza na ókè-ala-ya, na Ashkelon na ókè-ala-ya, na Ekron na ókè-ala-ya.
19. Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.
20. Ha we nye Keleb Hebron, dika Moses kwuru: o we napu umu Anak atọ ala-ha n'ebe ahu.
21. Ma umu Benjamin anapughi ndi Jebus ndi bi na Jerusalem ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Benjamin nime Jerusalem, rue ta.
22. Ma ulo Josef, ha onwe-ha rigoru-kwa-ra Bet-el: Jehova we nọyere ha.
23. Ulo Josef we ziga iledo Bet-el. (Ma aha obodo ahu na mb͕e gara aga bu Luz.)
24. Ndi nēche nche we hu otù nwoke ka o nēsi n'obodo ahu puta, ha we si ya, Biko, gosi ayi nbata obodo a, ayi gēme-kwa-ra gi ebere.
25. Ọ we gosi ha nbata obodo ahu, ha we were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu; ma ha zipuru nwoke ahu na ab͕uru-ya nile.
26. Nwoke ahu we je ala ndi Het, wue obodo, kpọ aha-ya Luz: nke ahu bu aha-ya rue ta.
27. Manase anapughi ndi bi na Bet-shan na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, ala-ha: ma ndi Kenean jisiri ike ibiri n'ala ahu.
28. O rue, mb͕e Israel di ike, na ha tiyere ndi Kenean n'ifè-òfùfè, ma ha anapusighi ha ala-ha.
29. Efraim anapughi kwa ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha; ndi Kenean we biri na Gezea n'etiti ha.
30. Zebulun anapughi ndi bi na Kitron, na ndi bi na Nahalol, ala-ha; ndi Kenean we biri n'etiti ha, ghọ ndi nọ n'ifè-òfùfè.
31. Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:
32. ndi Asha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi n'ala ahu: n'ihi na ha anapughi ha ala-ha.