5. Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta:
6. ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n'uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia.
7. Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.
8. Ọzọ, n'ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n'uzọ iri; ma n'ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu.
9. Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n'uzọ iri, na o site-kwa-ra n'aka Abraham nye otù uzọ n'uzọ iri;