Ndi-Hibru 5:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. n'ihi nka o ji kwa ugwọ iche àjà n'iru Chineke n'ihi nmehie, dika ọ nēchere ndi Israel, otú ahu ọ nēche-kwa-ra onwe-ya.

4. Ọ dighi kwa onye ọ bula nānara nsọpuru a n'onwe-ya, kama mb͕e Chineke nākpọ ya, ọbuná dika Ọ kpọ-kwa-ra Eron.

5. Otú a Kraist enyeghi kwa Onwe-ya otuto ka ewe me Ya onye-isi-nchu-àjà, kama ọ bu Onye siri Ya,Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,Mu onwem amuwo Gi ta:

6. dika O si kwu kwa n'ebe di iche, si,Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebiDika usoro Melkizedek si di.

7. Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,

8. ọ bu ezie na Ọ bu Ọkpara, ma Ọ mutara iṅa-nti-Ya site n'ahuhu nile Ọ huru;

9. ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;

10. Onye Chineke nyere aha onye-isi-nchu-àjà dika usoro Melkizedek si di.

Ndi-Hibru 5