8. N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.
9. Ya mere idebe-ubọchi-izu-ike fọduru ndi nke Chineke.
10. N'ihi na onye bataworo n'izu-ike-ya, ya onwe-ya ezuwo kwa ike n'ọlu-ya nile, dika Chineke zuru ike n'ọlu nke aka Ya.
11. Ya mere ka ayi nānu ọku n'obi ibà n'izu-ike ahu, ka onye ọ bula ghara ida n'otù ihe-nṅomi ahu nke ekweyeghi-ekweye.
12. N'ihi na okwu Chineke di ndu, nālusi kwa ọlu ike, di kwa nkọ kari mma-agha ọ bula nke nwere iru abua, nādu kwa rue n'ikewa nkpuru-obi na mọ, ma njikọta ma umi, buru kwa ihe nwere ike ituputa èchichè na izù nile nke obi.