3. àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;
4. Chineke nēso kwa ha nāb͕akọ àmà, site n'ihe-iriba-ama na ọlu-ebube di iche iche, site kwa n'ọlu ike di iche iche, site kwa n'òkìkè nke Mọ Nsọ, dika ọchichọ nke aka Ya si di.
5. N'ihi na ọ bughi n'okpuru ndi-mọ-ozi ka O doro elu-uwa dum madu bi nke gaje ibia, bú nke ayi nēkwu okwu bayere ya.
6. Ma otù onye kwusiri ike n'otù ebe, si,Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?Ma-ọbu nwa nke madu, na I nēleta ya?
7. I mere ya ka ọ di kari ndi-mọ-ozi ala nke-ntà;I ji ebube na nsọpuru kpube ya n'isi dika okpu-eze,I do-kwa-ra ya onye-isi ọlu nile nke aka-Gi abua: