Ndi-Hibru 11:21-28 Bible Nso (IGBOB)

21. Mb͕e Jekob nānwu anwu, ọ bu okwukwe ka o ji gọzie umu-ndikom Josef n'otù n'otù; kpọ kwa isi ala nye Chineke, nādabere n'isi nkpa-n'aka-ya.

22. Mb͕e ndu Josef nāgwu, ọ bu okwukwe ka o ji kwue, ihe bayere ọpupu nke umu Israel; nye kwa iwu bayere ọkpukpu-ya.

23. Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu.

24. Mb͕e Moses toruru madu, ọ bu okwukwe ka o ji ju ka akpọ ya nwa-nwoke nke nwa-nwanyi Fero;

25. n'ihi na ọ chọrọ ka emejọkọ ya na ndi nke Chineke, kama inwe ihe-utọ nke nmehie na nwa oge;

26. ebe ọ guru ita-uta nke Kraist-ayi n'àkù dikariri àkù nile nke Ijipt uku: n'ihi na ọ wepuru anya-ya le nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ahu.

27. Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n'ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n'ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya.

28. Okwukwe ka o ji me ememe ngabiga ahu, ya na nwusa ọbara ahu, ka onye ahu nēbibi umu eburu uzọ mu we ghara imetu ha aka.

Ndi-Hibru 11