37. N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.
38. Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu:Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.
39. Ma ayi onwe-ayi adighi n'etiti ndi wezugara onwe-ha ila n'iyì; kama ayi di n'etiti ndi kwere ekwe inweta nkpuru-obi-ha.