Ndi-Hibru 10:29-38 Bible Nso (IGBOB)

29. ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?

30. N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.

31. Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu.

32. Ma nēchetanu ubọchi mbu ahu, nke ọ bu nime ha, mb͕e enyesiri unu ìhè, ka unu tachiri obi n'oké ib͕a-nb͕a nke ahuhu di iche iche;

33. n'otù akuku, ebe ewere ita-uta na nkpab͕u di iche iche me unu ka unu buru ihe-nkiri; n'akuku ọzọ, ebe unu ghọrọ ndi nēso ndi nēbi obi otú a nwekọ ahuhu.

34. N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa.

35. Ya mere unu etufula nkwuwa-okwu-unu, bú ihe nke nwere oké nnyeghachi nke ugwọ-ọlu.

36. N'ihi na ntachi-obi di unu nkpà, ka ọ gābu, mb͕e unu meworo ihe Chineke nāchọ, ka unu we nata nkwa ahu.

37. N'ihi na le ka nwa oge ntà fọduru ra,Onye ahu Nke nābia gābia, Ọ gaghi-anọ kwa ọdù.

38. Ma onye ezi omume nkem gēsite n'okwukwe di ndu:Ọ buru kwa na ọ gēwezuga onwe-ya, ihe-ya adighi nkpuru-obim ezi nma.

Ndi-Hibru 10