Ndi-Hibru 1:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,

2. Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;

3. Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;

4. ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.

5. N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,Mu onwem amuwo Gi ta?ọzọ kwa,Mu onwem gāburu Ya Nna,Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?

6. Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.

7. Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

8. ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.

9. I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere GiManu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.

Ndi-Hibru 1