8. Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi.
9. Ya mere ndi sitere n'okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham.
10. N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.
11. Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n'onye ezi omume n'iwu n'iru Chineke: n'ihi na, Onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu;
12. ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.
13. Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:
14. ka ngọzi nke Abraham we rue ndi mba ọzọ nime Kraist Jisus; ka ayi we site n'okwukwe ahu nara nkwa Nke bu Mọ Nsọ.