3. Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
4. Onye nyere Onwe-ya n'ihi nmehie nile ayi, ka O weputa ayi n'ajọ oge nke di ub͕u a, dika ọchichọ nke Chineke, bú Nna-ayi, si di:
5. Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
6. Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;
7. nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist.
8. Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n'elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide).
9. Dika ayi kwuworo n'oge gara aga, anamekwu kwa ya ub͕u a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi nke unu natara, ya buru anathema (onye mmegide).
10. N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.
11. N'ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m'zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara.
12. N'ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist.