19. Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.
20. Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.
21. Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia.
22. Ma nzukọ nile nke Judia nke di nime Kraist nọ nāmaghi irum:
23. ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n'oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n'oge gara aga;
24. ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.