Ndi Galetia 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Pọl, onye-ozi (ọ bughi site na madu, o siteghi kwa n'aka madu, kama o sitere n'aka Jisus Kraist, site kwa n'aka Chineke, bú Nna, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie),

2. na umu-nna-ayi nile ndi mu na ha nọ, ayi nēdegara nzukọ Kraist nile nke Galetia akwukwọ:

3. Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4. Onye nyere Onwe-ya n'ihi nmehie nile ayi, ka O weputa ayi n'ajọ oge nke di ub͕u a, dika ọchichọ nke Chineke, bú Nna-ayi, si di:

5. Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

6. Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;

7. nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist.

Ndi Galetia 1