Ndi Filipai 4:13-15 Bible Nso (IGBOB)

13. Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

14. Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um.

15. Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;

Ndi Filipai 4