Ndi Filipai 4:12-17 Bible Nso (IGBOB)

12. Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà.

13. Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.

14. Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um.

15. Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu;

16. n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.

17. Ọ bughi na anamachọ onyinye ahu; kama anamachọ nkpuru ahu nke nāba uba iguyere unu.

Ndi Filipai 4