Ndi Filipai 2:14-22 Bible Nso (IGBOB)

14. Menu ihe nile nējighi ntamu na iru-uka ọ bula;

15. ka unu we ghọ ndi nādighi ita uta ndi nāghọghi kwa aghughọ, umu Chineke ndi anāpughi ita uta n'etiti ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke nēnwe kwa anya-uhie, ndi anāhu unu n'etiti ha dika ndi nēnye ìhè n'uwa,

16. nēche okwu nke ndu n'iru madu; ka m'we nwe ihe inya isi nye n'ubọchi nke Kraist, na ab͕aghi m ọsọ n'efu, na adọb͕ughkwam onwem n'ọlu n'efu

17. E, ọ buru kwa na anāwusim dika àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu àjà na ifè-òfùfè nke okwukwe-unu, anamaṅuri ọṅu, so kwa unu nile nāṅuri ọṅu:

18. n'otù uzọ ahu unu onwe-unu, ṅuri-kwa-nu ọṅu, sokwam nāṅuri ọṅu.

19. Ma anamele anya nime Onye-nwe-ayi Jisus na m'gēzigara unu Timọti ọsọsọ, ka mu onwem we nwe kwa obi-utọ, mb͕e m'mara ọnọdu-unu.

20. N'ihi na enweghi m onye ọ bula nke nkpuru-obi-ya yiri nke ya, bú onye gēcheb͕u onwe-ya bayere ọnọdu-unu n'ezie.

21. N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist,

22. Ma unu mara ọnwunwa-ya, na, dika nwa nēso nna-ya, otú a ka o sorom buru orù n'izisa ozi ọma.

Ndi Filipai 2