Ndi Filipai 1:11-30 Bible Nso (IGBOB)

11. ebe unu gābu ndi juputaworo na nkpuru nke ezi omume, nke sitere n'aka Jisus Kraist, ka Chineke we nwe ebube na otuto.

12. Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru;

13. ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ;

14. o me kwa ka ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n'ab͕um.

15. Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma:

16. ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma:

17. ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um.

18. Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya.

19. N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist,

20. dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile.

21. N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù.

22. Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m.

23. Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku:

24. ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu.

25. Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe;

26. ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ.

27. Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike;

28. ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke;

29. n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya:

30. ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.

Ndi Filipai 1