Ndi Efesọs 3:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. bú, na ndi mba ọzọ bu ndi soro ayi ketakọ ihe, na idikọ n'otù aru, na ikèkọ nkwa ahu nime Kraist Jisus site n'ozi ọma,

7. nke emerem ka m m'buru onye nēje ozi ya, dika onyinye nke amara ahu nke Chineke si di nke enyerem dika ilusi-ọlu-ike nke ike-Ya si di.

8. Ọ bu mu onwem, bú onye di ntà kari onye dikarisiri ntà n'etiti ndi nsọ nile, ka enyere amara nka, izisara ndi mba ọzọ ozi ọma nke àkù nke Kraist nke anēnweghi ike ituputa ya;

9. na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n'oge nile, Onye kère ihe nile;

10. ka ewe me ub͕u a ka ibu-isi nile na ike nile nke di n'ebe di n'elu-igwe mara ọtutu okpukpu amam-ihe Chineke di iche iche site n'aka nzukọ-Ya,

11. dika ìzù nke mb͕e nile ebighi-ebi si di nke O zubere nime Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi:

12. ọ bu kwa nime Ya ka ayi sitere n'okwukwe nke ayi kwere na Ya nwe nkwuwa-okwu na nkpọbata nime ntukwasi-obi.

13. N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.

14. Ọ bu n'ihi nka ka m'ji b͕ue ikperèm abua n'ala nye Nna-ayi,

15. Onye esitere na Ya gu eriri-nna nile ọ bula n'elu-igwe na n'elu uwa aha,

16. ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu;

17. ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya,

18. ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi,

Ndi Efesọs 3