Matiu 7:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Sinu n'ọnu-uzọ di warara bà: n'ihi na obosara ka ọnu-uzọ ahu di, mbara ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà n'ila-n'iyì, ọtutu ka ha di kwa, bú ndi nēsi na ya nābà.

14. N'ihi na warara ka ọnu-uzọ ahu di, nkpagide ka uzọ ahu di kwa, nke nēdubà na ndu, ole-na-ole ka ha di kwa, bú ndi nāchọta ya.

15. Nēzenu ndi-amuma ugha, ndi nābiakute unu n'ihe-oyiyi aturu, ma n'ime ha bu agu nāpunara aturu.

16. Unu gēsite na nkpuru-ha mazu ha. Màdu nēkpokọputa nkpuru-vine n'ogwu, ma-obu fig n'uké?

17. Otú a ezi osisi ọ bula nāmi nkpuru ọma; ma osisi nābaghi n'ihe nāmi ajọ nkpuru.

18. Ezi osisi apughi imi ajọ nkpuru, osisi nābaghi n'ihe apughi kwa imi nkpuru ọma.

19. Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.

Matiu 7