Matiu 6:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.

16. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.

17. Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;

18. ka i ghara igosi madu onwe-gi na i nēbu ọnu, kama gosi Nna-gi Nke di na nzuzo: Nna-gi, Nke nāhu ihe na nzuzo, gēnyeghachi kwa gi.

19. Unu akpadola àkù n'uwa nye onwe-unu, ebe nla na nchala nērichapu, ebe ndi-ori nēgwupú kwa nēzu kwa ori:

20. kama kpadonu àkù n'elu-igwe nye onwe-unu, ebe nla ma-ọbu nchala nādighi-erichapu, ebe ndi-ori nādighi-egwupú kwa, ha adighi-ezu kwa ori:

21. n'ihi na ebe àkù-gi di, n'ebe ahu ka obi-gi gādi kwa.

22. Oriọna nke aru bu anya: ya mere ọ buru na anya-gi ele otù ebe, aru-gi dum gējuputa n'ìhè.

Matiu 6