11. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta.
12. B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ.
13. Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.
14. N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu.
15. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.
16. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu nēbu ọnu, unu aghọla ndi nāb͕aru iru, dika ndi-iru-abua: n'ihi na ha nēmebi iru-ha, ka ha were onwe-ha gosi madu na ha nēbu ọnu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha.
17. Ma gi onwe-gi, mb͕e i nēbu ọnu, were manu te n'isi-gi, sa kwa iru-gi;