Matiu 5:36-41 Bible Nso (IGBOB)

36. Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n'ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji.

37. Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n'ajọ onye ahu.

38. Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé:

39. ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.

40. Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.

41. Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua.

Matiu 5