24. Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.
25. Ọtutu ìgwè madu we si na Galili na Dekapọlis na Jerusalem na Judia na n'ofè Jọdan so Ya.