Matiu 4:14-20 Bible Nso (IGBOB)

14. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

15. Ala Zebulun na ala Naftali,N'uzọ oké osimiri, n'ofè Jọdan,Galili nke ndi-mba ọzọ,

16. Ndi ahu nke nānọdu n'ọchichiriHuru oké ìhè,Ndi nānọdu kwa n'ala na onyinyo ọnwu,Ndia ka ìhè walitere.

17. Site na mb͕e ahu Jisus malitere ikwusa, na isi, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso.

18. Ma mb͕e Ọ nējeghari n'usọ oké osimiri Galili, Ọ huru umu-nne abua, Saimon nke anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya, ka ha nāwuye ub͕u n'oké osimiri; n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

19. O we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme unu ndi-ọkù nākuta madu.

20. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

Matiu 4