Matiu 4:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Mb͕e ahu Mọ Nsọ duru Jisus rigo n'ọhia ka ekwensu we nwa Ya.

2. Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya.

3. Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.

4. Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.

5. Mb͕e ahu ekwensu kuru Ya bà n'obodo nsọ; o we guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke,

Matiu 4