Matiu 28:2-10 Bible Nso (IGBOB)

2. Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya.

3. Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow:

4. site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu.

5. Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe.

6. Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ.

7. Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.

8. Ha we were egwu na oké ọṅù la ọsọsọ site n'ílì ahu, b͕a kwa ọsọ ikọrọ ndi nēso uzọ-Ya akukọ a.

9. Ma le, Jisus zutere ha, si, Ṅurianu ọṅu. Ha we bia jide ukwu-Ya abua, kpọ isi ala nye Ya.

10. Mb͕e ahu Jisus si ha, Unu atula egwu: jenu kọrọ umu-nnam ka ha je Galili, n'ebe ahu ka ha gāhukwam.

Matiu 28