Matiu 28:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. si, Sinu, Ndi nēso uzọ-Ya biara n'abali, zuru Ya n'ori mb͕e ayi nāraru ura.

14. Ọ buru kwa na nka ruru nti onye-isi, ayi onwe-ayi gārafu ya, me ka unu ghara icheb͕u onwe-unu.

15. Ha we nara ego ahu, me dika eziri ha: ewe b͕asa okwu a n'etiti ndi-Ju, rue ta.

16. Ma ndikom iri na otù ahu ndi nēso uzọ-Ya gara Galili, rue ugwu ebe Jisus gwara ha.

17. Mb͕e ha huru Ya, ha we kpọ isi ala nye Ya: ma ufọdu nwere obi abua.

Matiu 28