Matiu 26:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.

5. Ma ha siri, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù we ghara iputa n'etiti ndi-Ju.

6. Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta,

7. otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri.

8. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini?

9. N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.

10. Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum.

11. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.

12. N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì.

13. N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.

14. Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà,

15. si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya.

Matiu 26