1. Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu.
2. Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche.
3. N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha:
4. ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha.
5. Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru.